Unknown gunmen attacks: Ugboro asaa n'ime abalị asaa gara aga ndị 'unknown gunmen' wakporo mpaghara Ọwụwa Anyanwụ – BBC

Ọwụwa Anyawụ Naịjirịa abụrụla ebe mwakpo na-arị ibe ya elu ọkachasị n'akụkụ Imo na Anambra steeti
Mpaghara Ọwụwa Anyanwụ Naịjirịa ejirila nwayọọ nwayọọ na-aghọ ebe ndị mmadụ enweghịkwa ike ịnụ mmiri tọgbọ iko.
Kwa ụbọchị ka akụkọ ịwakpo ụlọ ndị nkịtị, ịwakpo ụlọorụ gọọmentị maọbụ nke ndị uweojii, igbu mmadụ, nakwa ịtọrọ mmadụ ga-apụtarịrị n'otu steeti maọbụ nke ọzọ.
BBC Igbo gụtara ugboro asatọ ụdị ọdachi a dapụtara na steeti anọ na mpaghara ala Igbo n'ime abalị asaa gara aga.
Nke a na-eme n'agbanyeghị mbọ ndị ọrụ nchekwa sị na ha na-agba iji mee ka udo lọghachi.
Lee ụfọdụ n'ime ha ebe a:
1.N'Anambra steeti, ndị ojiegbe amaghị ndị ha bụ wakporo ndị ọrụ 'Federal Road Safety Corps' ma gbuo mmadụ abụọ n'ime ha.
Nke a mere n'okporoụzọ si Igboukwu aga Uga .
Otu n'ime ndị ọrụ nchekwa ahụ ka e buuru gawa ụlọọgwụ maka mgbọ tụrụ ya, ebe onye nke ọzọ ji ọsọ gbabaa ime ọhịa.
Onyeisi ndị FRSC bụ Boboye Oyeyemi kwuru na ha na ndị uweojii amalitela nnyocha iji mata ndị kpara arụ a ma taa ha ahụhụ.
2. N'Imo Steeti, n'elekere abụọ nke isi ụtụtụ otu ụbọchịụka ahụ, ndị ekperima bu egbe wakporo isi ụlọọrụ Ọkpuru Ọchịchị Orsu dị n'Imo steeti.
Ha gbara ụlọ niile nakwa ụgbọala niile dị ebe ahụ ọkụ.
Ebe foto si, Getty Images
3. N' Imo steeti. ndị ojiegbe wakporo ụlọ Kọmishọna na-ahụ maka ọrụ bụ Ford Ozumba ma tinye ụlọ ya ọkụ.
Nke a mere n'obodo Umuhu Okabia n'okpuruọchịchị Orsu, Imo steeti.
4. N'Anambara Steeti, ndị oji egbe wakpokwara ụlọọrụ ndị uweojii n'obodo Osumenyi, Amichi na Ezinifite.
Obodo atọ a dị n'okpuruọchịchị Nnewi South n'Anambra steeti.
Obodo ndị a dịkwa nso na mpaghara Orsumoghu, Ukor na Azia nke dịkwa nso n'okpuruọchịchị Orsu n'Imo steeti ebe ndị ọgụ 'Eastern Security Network' na-akpa ike.
5. N'Ebonyi Steeti, n'otu ụbọchị Fraịde a, ndị uweojii Ebonyi steeti gbagburu otu onye n'ime ndị omekome bu egbe wakpoo ha n'obodo a kpọrọ Omege Noyo nke dị n'okpuru ọchịchị Ikwo.
Ndị uweojii bụ ndị na-echekwa otu ụlọọrụ na-ewu ụlọ na mpaghara ahụ, mana otu onye n'ime ha merụrụ ahụ dịka mgbọ tụrụ ya oge ha na ndị ekperima ahụ na-akwakọrịta mgbọ.
Loveth Odah, bụ onye na-ekwuru ndị uweojii Ebonyi steeti kwuru na ihe a mere eme.
Ebe foto si, Chukwuma Soludo/Facebook
6. N'Anambra steeti, ndị ekperima wakporo isi ụlọọrụ Ọkpuru Ọchịchị Nnewi South dị n'Ụkpọ,
Ha gburu otu nwoke na-eche nche ebe ahụ ma gbakwaa ụlọ niile dị n'ogige ahụ ọkụ.
Mwakpo a mere n'abalị ụbọchị Wenezde, Maachị 31.
Gọvanọ Anambra steeti bụ Chukwuma Soludo gara njem nleta ebe ahụ, ma kpọọ oku ka ndị na-akpa arụ a chegharịa echiche
Ebe foto si, Getty Images
Ndị o ji egbe amabeghị ndị ha bụ wakporo ụlọ kọmịshọna ọrụ na owuwe ọrụ n'Imo steeti
7. N'Imo steeti n'isi ụtụtụ ụbọchị Mọnde, ndị ekperima bu egbe wakporo ụlọọrụ ndị uweojii dị n'obodo a kpọrọ Otoko.
Obodo a dị n'okpuru ọchịchị Obowo nke dị n'Imo steeti.
Ha na ndị uweojii kwakọrịtara mgbọ ogologo oge nke mere na ha enweghị ike ịbanye n'ime ogige ndị uweojii ahụ mebie ihe.
Mana ndị uweojii abụọ ka mgbọ tụrụ oge ha na-ebuso ndị ekperima ahụ agha.
Ọnụ na-ekwuru ndị uweojii bụ Michael Abattam gwara ndị ntaakụkọ na ya bụ ihe mere n'ezie.
8. N'Enugwu, n'otu ụbọchị Mọnde ahụ, ndị ekperima wakporo mpaghara Odegba, n'okproụzọ Iva Valley.
Akụkọ kwuru na ndị ekperima kwara mgbọ n'ụgbọala bu ndị mmadụ agafe ma merụọ ọtụtụ n'ime ha ahụ.
Ụfọdụ kwuru na e nwere ndị nwụrụ na mwakpo a, mana ndị uweojii gwara ndị ntaakụkọ Vanguard na enweghị onye nwụrụnụ.
"Ndị ọrụ anyị gbatara n'oge maburu ndị merụrụ ahụ buga ụlọọgwụ," Daniel Ndukwa, ọnụ na-ekwuru ndị uweojii Enugwu steeti kwuru.
Ebe foto si, Facebook
Gọvanọ Anambra Steeti bụ Chukwuma Soludo arịọla ndị niile bu egbe akpa ike ka ha kwụsị ime etu a, kama ka ha pụta ka ha na ya nwee mkparịta ụka.
O kwuru na ya dị njikere inye ha mgbaghara pụrụ iche bekee kpọrọ 'Amnesty' ma ọ bụrụ na ha dosa ngwaọgụ ha.
Soludo kwekwara nkwa na ọchịchị ya ga-agbalịsị ike ịhụ na gọọmentị etiti tọhapụrụ Nnamdi Kanu, bụ onye isi ndị otu na-azọ nnwereonwe Biafra a kpọrọ 'Indigernous People of Biafra'.
Gọọmentị Naịjirịa nwụchiri Nnamdi Kanu ma jide ya na mkpọrọ n'Abuja kamgbe ọnwa June 2021.
Nke a so n'ihe na-ewe ndị otu ya iwe mere ụfọdụ n'ime ha ji buru egbe malite inye nsogbu.
N'otu aka ahụ kwa, gọvanọ steeti ndị ọzọ dị n'ala Igbo na ha na-agbalị ike ha iwulite ọnọdụ nchekwa na steeti ha dị icheiche.
Mana ndị mmadụ ka na-ele anya ịmata mgbe mbọ niile ha sị ha na-agba ga-amịta mkpụrụ.
© 2023 BBC. BBC anaghị ahụta maka ọdịnaya nke saịtị ndị dị na mpụga. Usoro anyị maka njikọ dị na mpụga.

source